Ọkammụta Soludo kwuru na teknụzụ BVA ndị INEC tere mmadụ ure

Ọkammụta Chụkwụma Soludo Ọkammụta Chụkwụma Soludo Onyoonyoo si na 247ureports

"Ubọchị ndị nwe nta ka ha nwe mba ọgụ - Okwu ndị mbụ na ndị egede!

Ụlọ ọrụ News Agency of Nigeria (NAN) na-akọwa na ngwaọrụ maka nhazi ntuli aka nke a kpọrọ “Bimodal Verification Accreditation” (BVA) na-ama ndị Independent National Electoral Commission (INEC) aka n'akụkụ ụfọdụ steeti Anambara.

Ọkammụta Chukwuma Soludo bụ onye na-azọ ọkwa Gọvanọ n’okpuru otu All Progressive Grand Alliance (APGA) kwupụtara mgbagwoju anya maka ọdịda teknụzụ nke Bimodal Verification Accreditation (BVA) ahụ.

Soludo kwuru na BVA ndị INEC akpụọla  teknụzụ afọ n’ala. Ọ riri arịrị na ọ kụọla otu elekere nke ehihie  ma amalitebeghị ịtụ akwụkwọ n'ọtụtụ mpaghara steeti ahụ. Ọ gbakwụnyere na n'ebe BVA na-arụ ọrụ na ọ na-ewe ihe dịka nkeji iri atọ iji hazite otu akwụkwọ a tụrụ atụ. O kwuru na ọ bụrụgodị na ngwaọrụ ahụ amalite ịrụ ọrụ nke ọma ugbu a na ọ gaghị ekwe omume iji oge fọdụrụ gụkọtacha ha niile a ga-atụ.

O kwukwara na akụkọ si Ihialla abịa na-agbarụ ọnụ n'ihi na ruo n’oge mgbede ahụ na ngwongwo ihe ntuli aka ahapụbeghị ngalaba ọchịchị ime obodo Ihiala. O kwubiri na INEC kwesịrị ịrụsi ọrụ ike ịhụ na ntuliaka gara nke ọma ebe niile.

Ọ rịọrọ ndị na-akwado APGA ka ha nwe ndidi ma hụ na ha tụrụ akwụkwọ nke ha oge ọ bụla ngwaọrụ BVA malitere ịrụ ọrụ.

Agbụrụ, asụsụ na omenala Igbo ga-adị!

 

A gụọla ya ugboro 844
Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!