Ụlọ ọgbakọ omebe iwu Imo achụtuola ọkà okwu ha bụ Mazị Emeziem

Ụlọ ọgbakọ omebe iwu Imo steeti Ụlọ ọgbakọ omebe iwu Imo steeti Onyoonyoo si na Chanels Television

"A gụrụ mbụ gụrụ abụọ, ọ bụrụ ajọ ọgụgụ - Okwu ndị mbụ na ndị egede!

Akụkọ na-erute anyị ntị ugbu a bụ n’ụlọ ọgbakọ omebe iwu Imo steeti achụtuola ọkà okwu ha bụ Mazị Paul Emeziem, onye nke so na pati APC nke Ọnụimo. Nke a kpọtụrụ n'ime ọgbakọ pụrụiche ha nwere n'ụbọchị Mọnde.

E nweghị nkọwa gbasara usoro nchụtu ọkà okwu ụlọ ọgbakọ omebe iwu ahụ dịka ndị isi ntaakụkọ News Agency of Nigeria (NAN) siri kọwa. Naanị nkọwa zuru oke anyị gụtara bụ na ọ bụ mmadụ itoolu n'ime iri mmadụ abụọ na asaa nke ụlọ ọgbakọ omebe iwu ahụ bụ ndị kwekọrịtara wee binye aka maka nchụtu Mazị Emeziem.

Ha họpụtakwara Mazị Kennedy Ibe bụ onye otu APC nke Obowo ka ọ bụrụzie ọkà okwu ọhụrụ n’ụlọ ọgbakọ omebe iwu ahụ.

N’izuụka gara aga ka Mazị Emeziem kwupụtara nchụtu osote ọkà okwu ọgbakọ omebe iwu ahụ bụ Mazị Amarachi Iwuanyanwụ. O kwukwaghị ihe mere ha jiri wepụ Iwuanyanwụ dịka osote ọkà okwu ọgbakọ omebe iwu.

Nrụtụaka - Premium Times

Agbụrụ asụsụ na omenala Igbo ga-adị!

A gụọla ya ugboro 801
Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!