INEC kwuru na nhọpụta gọvanọ Anambara ezubeghị oke ruo na a tụọ nke Ihiala

Independent National Electoral Commission (INEC) Independent National Electoral Commission (INEC)

"O nweghị otu e siri kpọcha anụ ewu ka a ghara ịtata ya aja - Okwu ndị mbụ na ndị egede!

Ọkammụta Florence Obi bụ onye ọrụ nchịkọta INEC kwụsịrị ịchịkọta nakwa ikwupụta onye meriri na ntuliaka gọvanọ Anambra n'abalị ụnyahụ.

Ọkammụta Florence Obi bụ osote onyeisi ụlọ akwụkwọ mahadum dị na Calabar. Ada kọwara na a ga-enwe ntụli aka ọzọ n'Ihiala nke ga-ewere ọnọdụ na Tuzdee, abalị itoolu nke ọnwa Nọvemba, n'afọ a bụ puku abụọ na iri abụọ na otu (2021). Nke a bụ maka ị tụzu akwụkwọ dị ka o siri dị na usoro iwu na usoro ntuliaka iji wee mara onye meriri na ntuliaka gọvanọ.

Lekwa otu okwe siri gba ugbu a.
Ọkammụta Chukwuma Soludo nke APGA nwetara vootu otu narị puku vootu na atọ na narị itoolu na iri anọ na isii (103946). Mazị Val Ozigbo n'okpuru PDP nwetara puku vootu iri ise na otu na narị atọ na iri abụọ na abụọ (51322).  Sinetọ  Andy Ụba n'okpuru APC nwetara narị vootu iri anọ na abụọ na narị  itolu na iri anọ na abụọ (42942) ebe Sinetọ Ifeanyi Ụba nwetara puku vootu abụọ na narị itoolu na irina asaa (2917).

Soludo bụbu gọvanọ ụlọ akụ etiti nke Nịjirịa (CBN).

Agbụrụ, asụsụ na omenala Igbo ga-adị!

A gụọla ya ugboro 845
Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!