Ndị Anambara apịala aka họrọ Soludo dịka onye ga-achị ha afọ anọ ọzọ

Ọkammụta Chukwuma Soludo Ọkammụta Chukwuma Soludo

 “Na mmiri e ji akwụọ aka ka e si ama ka ihe a ga-eri ha - Okwu ndị mbụ na ndị egede!

Ọkammụta Chukwuma Soludo bụ onye nke si n’okpuru otu APGA pụta eturula ugo dịka onye meriri na ntuliaka gọvanọ Anambara.

Ọ bụ kamgbe ụbọchị ụka ka e bidoro tụwa anya mmeri Soludo. Ntụzu nhọpụta nke emere n’Ihiala bụ ka e wee kpọnyere mmeri ya aka n’ihi na ụkwụ kpọrọ ịzaga bụ aka ka o nyeere ya n’ije.

N'ụtụtụ taata bụ Wenezde ka Ọkammụta Florence Obi bụ onye ọrụ nchịkọta INEC na ntuliaka gọvanọ Anambra nọrọ n'ụlọọrụ INEC dị n'Ọka kwuputa mmeri Soludo.

O kwuputara na Charles Chukwuma Soludo nke APGA emeriela na ntuliaka gọvanọ site na-imezu ihe iwu kwuru.

E jighị ugegbe elele ihe a gba n’aka. Soludo meriri na ọchịchị ime obodo iri na itoolu n'ime ọchịchị ime obodo iri abụọ na otu dị na steeti Anambara. O meriri Valentine Ozigbo nke PDP na Ifeanyị Ụba nke YPP ndị nke bụ mmadụ abụọ ritere nani otu ọchịchị ime obodo otu otu.

Ọ dị mwute na Andy Ụba nke APC enweghị ọchịchị ime obodo o ritere n'agbanyeghị na ọ bịara onye nke atọ.

Soludo ga-eweghara ọchịchị n’agụ Ọka n'ọnwa Maachị n'afọ puku abụọ na iri abụọ na abụọ (2022) mgbe ọchịchị nke abụọ Gọvanọ Willie Obianọ ga-abịa n’isi ngwụcha.

Lekwa otu ntuliaka nyere Soludo mmeri siri kwụrụ,
Ka APGA 112,229
PDP 53,807
APC 43,285
YPP 21,261

Agbụrụ, asụsụ na omenala Igbo ga-adị!

 

A gụọla ya ugboro 1125
Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!