Kwụsị ịkwatu akpụrụakpụ m, Okorocha

Sinetọ Okorcha na Gọvanọ Ụzọdịmma Sinetọ Okorcha na Gọvanọ Ụzọdịmma Onyonyo si n'Elombah.com

"Ọ bụkwa mmadụ nwe ọgọdọ ewu na-ata - Okwu ndị mbụ na ndị egede!

Sinetọ Rochas Okorọcha apịala gọvanọ Imo Steeti bụ Sintọ Hope Ụzọdịmma ọmụ azụ ka ọ kwụsị ịkwatusi ihe o wubegasịrị oge ọ bụ gọvanọ steeti ahụ.
Okorocha si n'aka onye ndụmọdụ ya pụrụ iche na mgbasa ozi bụ Maazị Sam Onwuemeodo wee ti ya bụ mkpu ma kwuo na ya ahụkwaghị mbọ ọzọ Ụzọdịmma na-agba maka ịrụ ihe ndị ọhụrụ.
Ọ rịọrọ gọvanọ Imo steeti bụ Ụzọdịmma biko ka ọ kwụsị ajọ agwa ahụ n'ihi na ebumnuche ya jiri rụ ihe ndị ahụ bụ maka mmepe ala Imo nakwa ọ dị mma ndị Imo.
Onye ndụmọdụ ya pụrụ iche na mgbasa ozi dekwara na gọvanọ Ụzọdịmma zigakwuru katapila ọzọkwa ụbọchị Tuzdee bụ abalị iri  abụọ na abụ n'ọnwa Disemba n'afọ 2020 ka ha ga kwatusie okporo ụzọ si na randabaụtụ Azọmta Owere (Owerri) gawa Ọlụ (Orlu) nke Okorọcha wuru iji mee ka ịkwọ ụgbọala dị mfe n'okporo ụzọ ahụ.
Sinetọ Okorocha kwukwara na ọ dị mwute na ọ bụ ugbu a ekeresimesi ruorola ka gọvanọ Ụzọdịmma họọrọ iji wee kwatu randabaụtụ Azọmta na-agbanyeghị na oge a bụ oge a na-atụ anya ọtụtụ ụgbọala n'ala Imo steeti. Nke kacha ya njọ bụ na ọ gwaghị ndị Imo ihe mere o jiri tirisie ya bụ randabaụtụ nakwa ihe ọ ga-eme ma ọ bụ rụọ ebe ahụ.
O kwuru na nke a abụghị nke mbụ, na tupu Gọvanọ Ụzọdịmma akwatuo randabaụtụ Azọmta na ọ akụribuolarị otu nnukwu ọrụ ọzọ nke Okorocha kpọrọ ọwara Akanu Ịbịam (Akanu lbiam tunnel) nke o wuru ebe ụzọ si Igweọcha (Port Harcourt) na ụzọ nke si ụlọ ọgbakọ omebe iwu (House of Assembly) jekọtara.
Okorocha kwuru na ihe ya ji maka ya wu ọwara ahụ bụ iji zọpụta ndụ ndị mmadụ n'ihi na tupu ya ewuwe ọwara ahụ na ndị mmadụ anwụọla n'ọdachi ụgbọala ebe ahụ nke ukwu.

Sinetọ Okorọcha kwukwara na gọvanọ Imo aghọrala otu izuụka otu ihe mmebi wee gụpụtakwa ihe ndị o mebierela kamgbe ọ bara ọchịchị.
O jiri ibibi otu ọrụ mbinye aka ya bụ ụlọgwụ SOMTO nke dị na saịtị mbụ ahịa Ekeukwu ma atụ, ya na iwepụcha ezigbo ọkụ eletriki o tinyere n'okporo ụzọ niile were ndị adịgboroja gbanwe ha. O mere ka a mata na ọkụ ọhụrụ ndị ahụ Ụzọdịmma tinyere anọbeghị ọnwa abụọ ma ha emebichala.
Okorocha gwara ndị Imo ka ha cheta na ọ bụkwa mmadụ nwe ọgọdọ ewu na-ata ma ka ha chetara gọvanọ Ụzọdịmma na ọrụ ndị ahụ o mebiri na ndị ọ ka ga-emebi bụ nke ndị Imo n'ihi na ọ bụ ego ha ka e jiri wube ha dum.

Gọvanọ Ụzọdịnma nọkwa kọwaara ohanaeze na ọ bụ maka iwu ezigbo randabaụtụ ga-abụ sọ mma ma bakwa uru mere ya jiri kụrie ọwara Akanụ Ịbịam Okorọcha.

Agbụrụ, asụsụ na omenala Igbo ga-adị!

A gụọla ya ugboro 428
Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!