IPOB adọla ndị gọvanọ ọdịda ọwụwa-anyanwụ aka na ntị

Ndị Gọvanọ ọdịda ọwụwa-anyanwụ Ndị Gọvanọ ọdịda ọwụwa-anyanwụ Onyonyo si na flashinfong.com

"Oke anaghị eri ihe onye mụ anya - Okwu ndị mbụ na ndị egede!

Ndị otu IPOB adọla ndị gọvanọ ọdịda ọwụwa-anyanwụ aka na ntị ụbọchị ụka gara aga ka ha ghara ịnwa anwa gba òtù nche ọhụrụ ha wubere bụ Eastern Security Netwoark (ESN) mgba okpuru n'ihi na mmasị ha nwere ịbụ onyeisi ala Naịjirịa.

Onye mgbasa ozi IPOB bụ Emma Powerful gwara ndị gọvanọ ala Igbo niile ka ha gbara ọgwụ ha ñụọ ma kwụsị ajọ omume dị otu a ma ọ bụ chee aka ghọrọ ụdị ọdachi ga-adakwasị ha. Ha dọkwuru ndị nche obodo nke ndị gọvanọ steeti hiwere dị iche iche aka na ntị ka ha ghara ikwe ka ndị gọvanọ na ndị ndu obodo nupu ha n’ihu were ha zere mgbọ nke ga-eme ka ha taa onwe ha ụta n'ikpe azụ. Emma Powerful kwukwara na ndị gọvanọ na ndị ndu obodo ga-aza ajụjụ ma awakpo ndị òtù nche ọhụrụ ahụ bụ Eastern Security Netwoark (ESN) n'obodo ha.

Ndị IPOB dụkwara ndị agha Naịjirịa na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ ọdụ ka ha kwụsị igosịwapụta ike ha ebe ESN nọ. IPOB gwara ha na ha kwesiri iji ike ahụ ha bu awagharị n'ala Igbo ga lụso ndị Boko Haram, ndị ohi na ndị na-awakpo ndị mmadụ na mgbago ugwu ọgụ ka ugwu wee Awụsa jụọ oyi.
IPOB kwụdosiri ike na ESN abụghị ndị agha Biafra kama na ha bụ ndị nche na-echekwa ndụ ndị bi na mpaghara ọwụwa anyanwụ ochie site n'aka ndị omekome na-ebute ọgbaghara nke na-abawanye kwa ụbọchị na mpaghara ọwụwa anyanwụ. Ha chere na ajọ ebumnuche ndị gọvanọ, bụ iweta ọgbaghara n'etiti òtù ndị nche obodo na ndị òtù nche ESN ka ndị agha Naịjirịa hụ ebe ha gbadoro ụkwụ wee wakpo ndị ọrụ ESN.

Ihe ndị a mere IPOB ji adọsi ndị nche obodo niile nọ na steeti Biafra aka na ntị ka ha tugharia uche ghara ịwakpo ndị òtù nche ESN maka na ya bụ égwú agaghị abụ egwu a na-achị ụtaba n'aka were agba. Ha mere ka o doo anya na obodo ọ bụla a wakporo ndị òtù nche ESN n’ala Biafra na ndị ndu obodo ahụ na gọvanọ ha ga-akwụ ụgwọ dị égwù maka ya bụ mwakpo.
Ha kachasị dọ gọvanọ Dave Ụmahị bụ gọvanọ nke Ebonyi steeti aka na ntị ka ọ gharakwa ịkpa agụ aka n'ọdụ ma ọ dị ndụ ma ọ nwụrụ anwụ. Ha gwara ya ka o buru n'obi na olilenya ya maka ịbụ onyeisi ala Naịjiria agaghị eme ka nnwere onwe Biafra kwụsị.

Agbụrụ, asụsụ na omenala Igbo ga-adị!

A gụọla ya ugboro 461
Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!