APGA bụ nke ndị Igbo niile, Agbọdike

APGA bụ nke anyị APGA bụ nke anyị Onyonyo si n'igbogaadi.com

"Ahụ ihe ka ubi, e re ọba - Okwu ndị mbụ na ndị egede!

Osote onye na-ekwuchitere ụlọ ọgbakọ omebe iwu steeti Anambara (House of Assembly) ma bụrụkwa onye otu nọchitere anya mpaghara mbinyeaka nke abụọ n'Ihiala bụ Họn Paschal Agbọdike ekwuola na ọ bụ iwu na òtù All Progressive Grand Alliance (APGA) ga-eweghara ọkwa ọchịchị na mpaghara ọwụwa-anyanwụ (East) niile dịka otu ndọrọndọrọ ọchịchị ala Igbo niile.

Na mkparịta ụka ya na DAILY INDEPENDENT, onye omebe iwu ahụ bụ Agbọdike kwuru na ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị ndị ọzọ na-eche echiche efu na ha ga-eweghara ọchịchị Anambara Steeti na ntuli aka gọvanọ n'afọ 2021.
Agbodike mere ka a mara na APGA tụkwasara Chineke obi mgbe niile ma kwuo na ngwụcha ọchịchị Gọvanọ Willie Obiani ga-abụ afọ iri na ise APGA chịrị steeti Anambra. N'agbanyeghị nke a na APGA akwadobeghị ịhapụ oche ọchịchị Anambara steeti. O mere ka a mara na olile anya APGA bụ iweghara mpaghara ndịda ọwụwa anyanwụ (South-East) niile n'afọ 2021.

Onye omebe iwu ahụ kwuru na nkwa ahụ nna anyị ukwu bụ Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu, Eze Igbo Gburugburu kwere ndị ọdịda ọwụwa-anyanwụ (South-East) bụ na APGA ga-eweghara ala Igbo niile ga-emezu oge adịghị anya. N'uche ya ọ bụ ndị Anambara ga-eji aka ha họpụtara onwe ha ndị ndu na ntuliaka ọzọ na-abịa na steeti ahụ. O kwuru na nke kachasị dị mma bụ na ihe e megburu mma na-adị ndị Igbo mma nke bụ njirimara APGA.
O kwukwara na APGA arụọla ezigbo ọrụ iji me ka ndị Igbo ghọta ihe mere ha ga-eji họrọ ya dịka nke ndị Igbo niile na-abụghị naanị sọ nke ndị Anambara.

“Mpaghara ndị ọzọ nwere pati mpaghara nke ha ma APGA bụ nke anyị”, Agbọdike.

Agbụrụ, asụsụ na omenala Igbo ga-adị!

A gụọla ya ugboro 472
Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!