Akụkọ maka Biafra Football Club, Bianca Ojukwu

CF Biafra na Barcelona CF Biafra na Barcelona Onyonyo si n'ihuakwụkwọ Facebook Bianca

"Ọ na-abụ a na-akọrọ onye mba ọ na-agba n’aka n’ihi na mbịara mbịara anaghị ama ókè ala - Okwu ndị mbụ na ndị egede!

Ikwu amaghị ibe ezi ya, Lọlọ Dim Chukwuemeka Ọdụmegwu Ojukwu bụ ọlamma Bianca jiri akụkọ òtù asọmpi Biafra melite mmụọ ụmụigbo na mbido afọ 2020 n'ime Faceboo ya.

Bianca dere na n’ime ọnwa olemaole n'afọ 1969 mgbe ndị agha Naịjiria wakporo ala Biafra maka nkwupụta nnwere onwe, na ndị ntorobịa mmadụ olemaole bụ ndị hụrụ egwuregwu bọọlụ n'anya gbakọtara ọnụ wube òtù asọmpi na Valls, Barcelona (Spain) iji sọpụrụ ọgụ dị egwu nke ndị Biafra na-alụ.  Ha kpọrọ òtù asọmpi bọọlụ ahụ CF Biafra. Ha mepụtara ọkọlọtọ kara aka ma hiwe otu ọgbakọ asọmpi bọọlụ Biafra dịka usoro dị irè iji mee ka ụwa niile leba anya n'ọnọdụ mkpagbu Naịjirịa na-akpagbu Biafra oge ahụ. CF Biafra nwere ihe ruru otu narị ndị egwuregwu n'ime egwuregwu ndị na-amu amu (amateur) ma si na ndị na-amụ amụ gbagogide ruo agba nke atọ n’asọmpi (third league). Ya bụ CF Biafra dịgịdere ruo n’afọ 1978 mgbe a kwasra ya n'ihi na ha enwezighị ego ha ji elekwa ya.

Bianca gara n'ihu dee na òtù egwuregwu bọọlụ Biafra ahụ mere emume ncheta ọla edo (golden anniversary) ha ka afọ iri ise gachara. O dekwa na ọ bụụrụ ụmụ okorobịa ahụ ihe ngosi na ndọlị maka nnwere onwe na-agbanyeghị na Biafra emerighị ya bụ agha. Na nghọta ha, mpaghara nke ha bụ Katalonia (Catalonia) na-agabiga ụdịrị ajọ ọnọdụ mkpagbu ahụ n'aka gọọmentị Spain dịka Biafra si agabiga n'aka gọọmentị Naịjirịa.

E mekwara ngosị banyere akụkọ òtù asọmpi Biafra ahụ (CF Biafra Football Club) na Patio de Sant Roc n’ọnwa Juun n’afọ 2007.

Ndị ndu  nnọchi anya CF Biafra na Barcelona bụ Ramon Rovira & Oscar Gasso du ha bịa hụ Ezigbo gburugburu bụ Dim Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu n'Enugwu inye ya uwe-jesi njiri mara ha nakwa ọba akụkọ ihe mere eme nke òtù asọmpi Biafra ahụ 

O dekwara na ndị nnọchi anya nke òtù asọmpi Biafra ahụ bụ CF Biafra Football Club bịakwara Naịjirịa oge ahụ odogwu Biafra bụ Dim Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu hapụrụ n’afọ 2012 ka ha sonye n'emume olili ozu na ịkwanyere Ezigbo ugwu ikpeazụ.

Ha werekwara okwute n’ala Biafra oge ha na-ahapụ nke ga-abu ihe ncheta ga-ejikọta ala Biafra na Valls rue mgbe ebighi ebi.

Agbụrụ, asụsụ na ọmenala Igbo ga-adị!

A gụọla ya ugboro 614
Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!