Kọmishọna Madubuko agbaala arụkwaghịm,

Dọkịnta Christian Madụbuko Dọkịnta Christian Madụbuko Onyonyo si na thecable.ng

"A gbaghị ụzọ oweri mgba ọ naghị echi - Okwu ndị mbụ na ndị egede!

Ótù kọmishọna n’Anambara bụ nke na-ahụ maka ihe gbasara mba ofesi, ọ́rụ́nka ọdịnala, omenala na njem bụ Dọkịnta Christian Madubuko  agbaala arụkwaghịm n’ọrụ ya.

Madubuko dere ya bụ akwụkwọ arụkwaghịm  n’abalị nke ii na otu n’ọnwa Disemba nỊafọ 2020, ma nye ya ndị nta akụkọ ụbọchị Mọnde n’Ọka.

Onye Kọmishọna ochie ahụ kwuru na ya nwere mkpebi ya n’ihi nnukwu ụ̀rụ́ na asị dị n’ usoro ọchịchị steeti Anambara , o wee kpọkuo  Gov. Willie Obiano (Akpọkuedike Agụleri)  ka o bilie ma weghara ọchịchị gọọmenti ya

Kọmishọna Madụbuko n'akwụkwọ ozi arụkwaghịm ya, jiri obi ụtọ kelee ndị niile ya na ha rụkọrọ ọrụ ọnụ na steeti ahụ ma kọwa na afọ atọ ahụ ha rụkọrọ ọrụ jupụtara na nkuzi dị iche iche ma nke dị mma ma nke adịghị mma. Ọ gara n'ihu kọwaa na mgbe ya na-alụ ọgụ megide ndị ụ̀rụ́ na asị na-eri ego steeti, na ọtụtụ ndị mmadụ degaara  gọvanọ ụdị mkpesa na ebubo mmegide nzuzu dị iche iche megide ya.

O kwuru na ha boro ya ebubo na ya chọrọ ịkwasa na ịkwatu APGA, ma nye gọvanọ Obianọ ndụmọdụ ka ọ wepụ ya tupu ọ akwatuo APGA. O kwukwara na ha bụ ndị ojeozi ọchịchịrị, na ha gbalịrị ugboro ugboro inye ya aka azụ ma ya jụrụ ajụ.

Na okwu ya, “Ka ihe a niile na-eme, ọ bịa doo m anya na mgbe ọ bụla ị na-alụso ụ̀rụ́ na asị ọgụ, na ụ̀rụ́ na asị ga na-adọ kalịkalị na-alusochigha azụ.

“Esi m Ọstrelia  laghachita azụ ka m bịa soro dozie ma mepe steeti anyị. N’uche nke m, ekwenyere m na arụsiri m ọrụ ike iji mezuo ebumnuche m ahụ.”

Madubuko rụrụ ọrụ na steeti Anambra n’ọkwa dị iche iche, na mbụ e mere ya Kọmishọna na-ahụ maka ụlọ ọrụ na azụmahịa, mekwa ya Kọmishọna n'ahụ maka okporo ụzọ, ụgbọ oloko na njem mmiri. N'ikpeazụ ọrụrụ dịka kọmishọna na-ahụ maka ihe gbasara mba ofesi, ọ́rụ́nka ọdịnala, omenala na njem.

Ọ kọrọ otu ha siri guzobe ụlọ ikpe ngwa ngwa ma tụọ ọtụtụ ndị ohi na-eri ego ụ̀tụ́isi steeti nga ma mee ka ego steeti Anambara gbagolite. Onye kọmishọna ochie ahụ kwukwara na ya lụsoro ọtụtụ ndị omekaome ọgụ n’ụdị dị iche iche na-azọbighị onye ọ bụla ọkpa ma hụ na ekpere ha ikpe maka mmejọ ha.

“Ndị ahụ chere na m zọbiri ha ọkpa na-achụgharị  m ezughị ike.  Ha ewerela mgbọegbe gọzie m ebe ugboro atọ, ndị ọrụ ụ̀tụ́isi awakpola m otutu ugboro n’ime ahịa Ọnịcha (Onitsha Main Market) ma Chineke bụ ike m.

O kwusiri ike na mgbalị ahụ niile bụ ka ha wee  kwụsị ya ikpughe ndị omekaome ahụ na-etiri ego steeti nke kwesịrị ịbụ ego ndị Anambaraniile.  Ọ dụkwara Gọv. Willie Obiano (Akpọkuedike Agụleri) ọdụ ka ọ bụrụ dimkpa  ma weghara ọchịchị gọọmenti Anambara n’ihi na a gbaghị ụzọ owere mgba ma ya echila.

Kọmishọna na-ahụ maka mgbasa ozi bụ Mazị C-Don Adịnụba, zaghachiri azụ kwuo na gọọmentị steeti anatala akwụkwọ arụkwaghịm ahụ Madụbuko dere mana, Adịnụba jụrụ itinye ọnụ n’ebubo ụ̀rụ́ na asị ahụ Madubuko boro.

Mazị C-Don Adịnụba  kwubikwara na Madubuko ka bụkwa onye otu APGA tu ugo ya n’ihu isi. Ọ gbakwunyekwara na ya nwere nnukwu afọ ojuju maka iso n'ọchịchị Anambara ma kwuo na ya achọghị ihe ọ bụla ga-emebi ma ọ bụ tetọọ ọchịchị Obiano.

Agbụrụ, asụsụ na omenala Igbo ga-adị!

A gụọla ya ugboro 426
Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!