Soludo ahọpụtala Oby Ezekwesiịlị ka ọ bụrụ onye isi Mgbanwe ọchịchị

Oby Oby Ezekwesịlị

 “E were áká nye áká, o too ogologo - Okwu ndị mbụ na ndị egede!

Ọkammụta Charles Chukwuma Soludo ahọpụtala kọmitii ga-ahụ maka mgbanwe ọchịchị gọvanọ n'Anambara. Soludo họpụtara ndị teknụzụ na ndị ọkachamara ma leghara ndị ndọrọndọrọ ọchịchị anya.

Dọkịnta Oby Ezekwesiịlị, onye bụbu minista na-ahụ maka mmụta ga-abụ onyeisi kọmitii ahụ. Ndị dịka ọkammụta Benedict Oramah, ọkammụta  Pat Utomi na Chief Osita Chidoka so na iri mmadụ asatọ ndị e wepụtara aha ha. 

Bido n'abalị nke iri na itoolu ruo n'abalị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Jenụarị n'afọ puku abụọ na iri abụọ na abụọ (19 – 22 January 2021) ka a ga-anabata ndị kọmiti ahụ n'ụlọ nkwari bụ  Golden Tulip (Agulu Lake) nke dị n'Agụlụ. N'ime nnọkọ nke mbụ ahụ ka a ga-anọ kwupụta ma kọwakwa ụdị ọrụ ma ọ bụ ihe ọrụ ha ga-abụ.

Ha na ndị otu gọọmentị Anambara steeti hiwere ga-arụkọ ọrụ ọnụ iji hụ na mgbanwe ọchịchị site na'aka Gọvanọ Willie Obianọ gafee na nke Chukwuma Soludo ga-aga were were n’abalị iri na asaa n'ọnwa Maachị n'afọ puku abụọ na iri abụọ na abụọ (17 March 2022).

Ọ bụ onye enyemaka mgbasa ozi nke aka ga-achị steeti Anambara bụ Joe Anatune binyere aka n’ọkwa a. 

Agbụrụ, asụsụ na omenala Igbo gaa-adị!

A gụọla ya ugboro 991
Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!