Dọk. Nkem Okeke bụ Osote Gọvanọ Anambra Agbabala n'APC.

Dọkịnta Nkem Okeke na Onyeisiala M. Buhari Dọkịnta Nkem Okeke na Onyeisiala M. Buhari Onyoonyo si n'Elombah News

"Egwu dagharịa a tụgharịa ụkwụ egwu - Okwu ndị mbụ na ndị egede!

Osote aka na-achị steeti Anambara bụ Dọkịnta Nkem Okeke agbabala pati All Progressives Congress (APC) ka ntuliaka Gọvanọ Steeti Anambra na-akwado ịkpụrụ ọkụ.

Onyeisiala Nigeria bụ Muhammadu Buhari nabatara Dọk. Nkem Okeke bụ osote gọvanọ Anambara nakwa onye isi oche Kọmitii na-ahụ maka nlekọta APC ma bụrụkwa gọvanọ steeti Yobe bụ Mai Mala Buni ụbọchị Wenezde. Aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodinma sokwa na ndị duru ya ga.

Dọkịta Okeke arụọla ọrụ n'ọkwa dị iche iche na Anamabra nke n'ime ya bụ kọmishọna na-ahụ maka atụmatụ akụnaụba ya na kọmishọna na-ahụ maka ọrụ na njem na n'okpuru ọchịchị Gọvanọ Peter Obi.

Kọmishọna mgbasa ozi Anambara na steeti Anambara bụ C. Don Adịnuba kwuru na Dọkịta Okeke kwesịrị ịgba arụkwaghịm ugbu a n’ihi na ọ bụ na n'okpuru pati All Progressives Grand Alliance (APGA) ka a họpụtara ya dịka osote Gọvanọ n'afọ puku abụọ na iri na atọ (2013) ma họgharịkwa ya n'afọ puku abụọ na iri na asaa (2017).

Agbụrụ, asụsụ na omenala Igbo ga-adị!

A gụọla ya ugboro 760
Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!