A gbagbuola ndị uweojii mmadụ atọ n'Ebonyi Steeti

Ọkọlọtọ ndị uwe ojii Ọkọlọtọ ndị uwe ojii igbogaadi.org

"Ọ na-abụ a maa nwata ajọ nkwukwa ajọ ikwu apụọ ya n'ọnụ - Okwu ndị  mbụ na ndị egede!

Ndị uweojii nọ na steeti Ebonyi kwuru na ndị obu-egbe enweghị aha gburu ndị uwe ojii mmadụ atọ n'ime Abakaliki bụ isi obodo steeti Ebonyi. Ndị obu-egbe ahụ enweghị aha awakpola ndị uweojii ugboro ugboro na nso nso a n'akụkụ obodo ụfọdụ na mpaghara ọwụwa anyanwụ nke Naịjiria.

Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n’Ebonyị bụ Loveth Odah kwuru na a gbagburu ndị uweojii ahụ n’ọdụ nche ndịuwe ojii dị n'okporo ụzọ si Ọnụebonyi  gawa Nwezenyi n'ime Abakaliki n'abalị Wenesde bụ abalị iri anọ n'ọnwa Eprel n'afọ puku abụọ na iri abụọ na otu.

O bere arịrị na ndị omekaome ahụ bu keke na pepe megharịrị ndị uweojii anya dị ka ndị bu ozu ma ọ bụ ndị na-akwa ozu tupu ha wakpo ha bụ ndị uweojii were mgbọ wụọ ha ahụ. O kwukwara na ha ga-agbalịsi ike inwude ndị kpara mkpamkpa ahụ dị ka nyocha na-aga n'ihu.

N’otu aka ahụ, ọ rịọrọ ọha na eze ka ha kwado agha ndị uweojii na ndị ọrụ nche ndị ọzọ na-ebuso mpụ na Steeti ha site n'inye ha nkwado pụrụ iche dịka ịgbara ha ama ga-enyere ha aka n’ime nnyocha ha na-eme.

Agbụrụ, asụsụ na omenala Igbo ga-adị!

A gụọla ya ugboro 689
Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!