Ọha kpee mụ na Gọv. Ụzọdịmma ikpe – Senetọ Okorọcha

Okorọcha na Ụzọdịmma Okorọcha na Ụzọdịmma Onyonyo si na vanguardngr.com/

"A naghị amara onye ụlọ ọgọdọ mkpụ n’ala - Okwu ndị mbụ na ndị egede!

Sam Ọnwụemeodo bụ onye mgbasa ozi Sinetọ Okorọcha na mgbasa ozi ya dere na ndị Imo ga-eji aka ha mara ndị na-awakpo Imo steeti n'oge adịghị anya n’ihi na a naghị amara onye ụlọ ọgọdọ mkpụ n’ala.

O dere na mgbasa ozi ya na ha chọrọ ịhapụ ọhaneze ala Imo ka ha were aka ha kpebie ihe gbasara ebubo Gọv. Ụzọdịmma na ndị otu ya boro Sen. Okorocha gbasara nsogbu mwakpo dara n’Owerri.

O kwuru na afọ juru ha otu ndị Naịjiria siri leba ya bụ ebubo ụgha anya.

N’okwu ya, o dere na ọ bụ ihe ọchị otu Gọv Ụzọdịmma siri malie kwuo na ọ bụ ndị IPOB kpara mkamkpa ahụ kpara n’ime etiti abalị ụbọchị Mọnde bụ abalị ise n'ọnwa Eprel n'afọ puku abụọ na iri abụọ na otu. Na e kwughị ekwu nke e ji aka ọ tụgharịkwa kwuo na ọ bụzighị ndị IPOB na ọ bụzi ndị ndọrọndọrọ ọchịchị iwe na-ewe na Imo bụ ndị ma anya ya bụ mwakpo.

Otu ụbọchị ahụkwa ka kọmishọna n’ahụ maka mgbasa ozi bụ Hon. Mbadiwe Emelụmba nọrọ kwugharịa na Sen. Okorocha bụbu gọvanọ Imo ma anya ya bụ nsogbu mwakpo na-akpọtụ n’ime owerri.

Sen. Okorọcha wee jụọ gịnị kpatara gọọment jiri kwuo na ha ga-ehiwe otu nyocha ebe ha sị na ha ma ndị kwadoro ya bụ mwakpo.

Agbụrụ, asụsụ na omenala Igbo ga-adị!

A gụọla ya ugboro 1213
Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!