M. I. Ọkpara

Dọkịta Michael Iheọnụkara Ọkpara Dọkịta Michael Iheọnụkara Ọkpara Onyoonyo si na connectnigeria.com

Dọkịta Michael Iheọnụkara Ọkpara bụ nwaafọ Ụmụegwu Okpụala Ọhụhụ nke dịketere Umuahia. A mụrụ ya n’abalị iri abụọ na ise n’ọnwa Dicemba n’afọ 1920. Ọ gara ụlọ akwụkwọ ndị ụka n'ihi na ọ bụ nwa onye ọrụ ike kete orie enweghị ego. O mechara gaa Methodist College n’Uzuakọlị bụ ebe ọ nọrọ nweta ohere ịgụ maka ọmụmụ ahụike n'efu na Yaba Higher College dị na Legọsị. Ka  ọ gụchara akwụkwọ ọmụmụ ahụike ya na Nigerian School of Medicine, ọ rụọrọ gọọmentị ọrụ nwa obere oge dịka onye na-ahụ maka ahụike tupu ọ laghachị Umuahia ebe o mepere ụlọgwụ nke ya.

Mgbe o nwere mmasị na ndọrọndọrọ ọchịchị, dịka nwa okorobịa otu Zikist kachasị masị ya n'ihi na ndị otu Zikist bụ mpaghara otu National Council of Nigeria and the Cameroons (NCNC) na-akpa aghara. Ndị ọrụ na-egwu kolu na Enugu bịara nwe ọgbaghara maka itinyere ha tọrọ n’ụgwọ ọnwa n’afọ 1949, ndị uwe ojii wee gbagbuo ọtụtụ n’ime ha. A gara nwụchie Dọkịta M.I. Ọkpara ma bo ya ebubo na o soro kpalite ya bụ ọgbaghara ndị ọrụ na-egwu kolu nwere. Mgbe  ndị ọbịarachịwa hapụrụ Naịjiria inwe ọchịchị nke onwe n’afọ 1952, a họpụtara Ọkpara na ntụliaka dịka onye nnọchi anya ụlọ omebe iwu nke ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa n’okpuru NCNC. Ọ nọrọ n'ọkwa Kabinet dị iche iche na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa bido n’afọ 1952 ruo n’afọ 1959. Ọ rụkwra ọrụ dị ka Mịnịsta na-ahụ maka ahụike ya na Mịnịsta na-ahụ maka ọrụ ugbo na ihe mmepụta.

Dọkịta Iheọnụkara Ọkpara kwudosiri ike ma sonyere Dọkịta Nnamdị Azịkiwe mgbe ndị omebe iwu otu NCNC nupụụrụ ndị isi otu NCNC isi n'afọ 1953. Mgbe Azịkiwe mechara hapụ ndọrọndọrọ ọchịchị n'ọnwa nke Nọvemba n’afọ 1960 wee bụrụ Gọvanọ mbụ Naịjirịa, a họpụtara Ọkpara dịka onye ndu otu NCNC. Ezigbo nsogbu dara na mmekọrịta dị n'etiti otu ya bụ NCNC na Northern People's Congress bụ ndị na-achị oge ahụ n'ihi na Ọkpara anaghị asọ mmadụ anya nke o ji ata okwu eze were ekwu.

Ọkpara mechara bụrụ onye ndu ndị otu NCNC ka Naịjirịa nweere onwe ya n'afọ 1960. Ọ bụkwa onye isi ala ọwụwa anyanwụ Naịjirịa n’oge ọchịchị mbụ ahụ bido n’afọ 1959 ruo n’afọ 1966. Ọ lanahụrụ ihe ike na nnupụisi ndị okpuigwe jiri chụpụ ndị ọchịchị ntụliaka, ebe ndị isi ala abụọ ka ya tụfuru ndụ ha. E soro nwụchikọ ma kpọchie ya mgbe ahụ ndị okpuigwe naghaara ndị ndọrọndọrọ ọchịchị n’ọnwa Jenụwarị n’afọ 1966.

Ọkpara echezọghị ebe o si ya mere o jiri kwenye na ọ bụ ọrụ ugbo ga-azọpụta ma gbanwe Naịjiria otu ọ ga-esi dị mma. O jisiri ike nwee nnukwu ugbo a kpọrọ Ụmụegwu Ọkpụala Mixed Farms n’ime obodo ya iji mezuo ebumnuche ya. Nke a kpaliri mmụọ ọtụtụ ndị isi ala ọwụwa anyanwụ iso nzọ ụkwụ ya n’ihe gbasara ịkọ ọrụ ugbo. Ọ kwadokwara mmụta na mmepe ala Igbo nakwa ọwụwa anyanwụ ebe ọ dị ukwu.

Ọtụtụ ndị mmadụ kwenyere na ọ bụ oge Dọkịta Michael Ọkpara bụ onye isi ala ọwụwa anyanwụ Nigeria ka mpaghara ahụ hụrụ ihe. Dọkịta Ọkpara gbanwere mpaghara ọwụwa anyanwụ o si na mpaghara kachasị da ụbịam ghọrọ mpaghara Kwụsikarịchara ike nakwa nke na-eto eto. N'ime naanị afọ isii malite n’ọnwa Jenụwarị n'afọ 1960 ruo n'afọ 1966, mpaghara ọwụwa anyanwụ ghọkwara mpaghara kachasịrị nwe udo. Obodo dịgasị na mpaghara ọwụwa anyanwụ bidoro sọwa mpi n'ime onwe ha maka mmepe. 

Mgbe agha Biafra biri, Ọkpara gbapụrụ ga biri na mba Ireland. Dọkịta Iheọnụkara Ọkpara arụnwughị ụlọ nke ya ihe niile ọ nọrọ n'ọchịchị gọọmenti. Mana tupu o si mba Ireland loghachite azụ n’afọ 1979 maka ndọrọndọrọ, ndị enyi ya gbakọrọ aka ọnụ wuoro ya ụlọ n'obodo ya bụ Umuegwu.

Okpara nwụrụ n’abalị iri na asaa n’ọnwa Disemba n’afọ 1984 (17 December 1984).

Ka mkpụrụ obi Iheọnụkara zuru ike n’ime Chineke.
Ezigbo mmadụ adịghị fechaa

Agbụrụ, asụsụ na omenala Igbo gaa-adị!

A gụọla ya ugboro 135

Gụkwuo Akụkọ ndị ọzọ so:

Go to top

Maka ọ dị mma ndị Igbo, soro kọọ akụkọ onwe gị!