Chinụalụmọgụ Achebe

Chinụa Achebe Chinụa Achebe Onyoonyo si na wikipedia.com

Albert Chinụalụmọgụ Achebe bụ onye edemede kara aka, bụ onye nke e jiri "Chinua" Achebe wee mara. A na-elegara ya anya dị ka onye malitere akwụkwọ agụmagụ nke ọgbara ọhụrụ n'ọdịda anyanwụ Afrịka nakwa otu n'ime ndị odee nke asụsụ bekee pụtara ìhè n'ụwa. Ụfọdụ na-ekwukwa na Chinụalụmọgụ bụ otu n'ime ndị nna nke akwụkwọ agụmagụ ọgbara ọhụrụ nke Africa.

Achebe bụ onye Ogidi, a mụrụ ya n'afọ 1930 dịka nwa onye nkwusa oziọma, bụrụ nwa nke ise n'ime ụmụ isii. Ọ gara ụlọ akwụkwọ ndị ụka bụ nke a kpọrọ Mishọnskulu tupu ọ gawa kọleji ndị gọọmentị dị n'Ụmahịa. Bido n'afọ 1948, ọ gụrụ Bekee, akụkọ ihe mere eme na nkà mmụta okpukperechi na mahadum nke Ibadan. Ọ gara ọzụzụ dịka onye nta akụkọ mgbasa ozi na British Broadcasting Corporation (BBC) nke dị na mba Britenu ma laghachi Naịjiria na ngwụcha ọzụzụ ya. Bido n'afọ 1954, ọ rụrụ ọrụ na Nigerian Broadcasting Corporation (NBC) nke dị na Lagos afọ iri na abụọ, malite n'afọ 1958, ọ rụrụ n'Enugwu dịka onye isi ụlọ ọrụ na mpaghara ọwụwa anyanwụ.

Chinụalụmọgụ na nwunye ya bụ Chinwe Okoli-Achebe, bụ onye nke o zutere n'ụlọọrụ NBC n'afọ 1958 mụtara ụmụ anọ.  Dịka onye Igbo zuru oke ma ihe ọ na-eme, ọ bara ụmụ ya niile aha Igbo n'agbanyeghị na ọ bụ bekee n'onwe ya. Ọ gụrụ ada ya Chinelo, diọkpara ya Ikechukwu, osote ya Chidi, gụọ ọdụdụ nwa ya Nwando.

Ọ gbasiri mbọ ike n'akụkụ Biafra n'oge agha dịka nwa afọ, ọ gara mba Amerika na Iropu dị ka onye nnọchiteanya Biafra pụrụ iche bido n'afọ 1967 ruo n'afọ 1970. Ọ naara ọkwa ọkammụta na Mahadum Massachusetts dị n'Amherst Amerika site n'afọ 1972 ruo n'afọ 1976 ma mechaa bụrụ onye ọkammụta nke akwụkwọ agụmagụ na Mahadum Nsụka site n'afọ 1976 ruo n'afọ 1990.

Achebe dere ọtụtụ akwụkwọ agụmagụ, a na-ewerekwa ya dịka onye guzobere ụzọ ezigbo akwụkwọ agụmagụ Bekee nke ọdịda anyanwụ Afrịka. Ụzọ o si ede edemede ya bụ site n'akụkọ ọnụ nke ndị Igbo, nke mere ka ọ bụrụ otu n'ime ndị odee a na-agụkarị akwụkwọ ya na mpaghara ndịda Sahara. Asụgharịala akwụkwọ agụmagụ ya n'ihe karịrị asụsụ iri ise.

A na-ewere akwụkwọ agụmagụ mbụ ya bụ Things Fall Apart dị ka ihe ịrịba ama n'akwụkwọ agụmagụ Afrịka.

Achebe sonyeere ndị nna nna ya n'afọ 2013 na Boston Amerika, mgbe ọ dị iri afọ asatọ na abụọ.

Ka anyị kwụsịgodị ebe a n'ihi na otu ihu akwụkwọ agaghị akọcha akụkọ gbasara Ọkammụta Albert Chinụalụmọgụ Achebe.

Ụbọchị nta ka anyị chụọ ya n'owere nchi!

Ka mkpụrụ obi Chinụalụmọgụ zuru ike n’ime Chineke!

Agbụrụ, asụsụ na omenala Igbo ga-adị!

A gụọla ya ugboro 101

Gụkwuo Akụkọ ndị ọzọ so:

Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!