Agụiyi Ironsi

Agụiyi Ironso Agụiyi Ironso onyoonyo si na guardian.ng

Aha ya bụ Thomas Umunnakwe Agụiyi-Ironsi. A mụrụ ya n’Ibeku Umuahia na abali ato n’ime onwa Machị n’afọ 1924. Aha nna ya bụ Mazị Ezeugo Agụiyi. Nnukwu ada nne ya aha ya bụ Anyamma kpọọrọ ya oge ọ dị afọ asatọ. Nwanne ya nwanyị ahụ bụ lụrụ Theophilius Johnson bụ onye nnọchi anya mba Sierra Leone rụrụ ọrụ na Umuahia.  Aguiyi-Ironsi mechara were aha ikpeazụ ọgọ ya nwoke bụ Johnson dị ka aha mbụ ya iji kwụghachi ya ụgwọ n'ihe ọma niile o mere na ndụ ya. Ọ gbanwere aha ya zawazie Johnson Thomas Umunnakwe Aguiyi-Ironsi.

Aguiyi-Ironsi gụrụ akwụkwọ praịmarị ya n’Ụmụahịa ma gụọ nke sekọndrị na Kano. Ọ dị afọ iri na asatọ n’afọ 1942 mgbe o sonyere ndị okpuigwe Naịjiria na-agbanyeghị na nwanne ya nwanyị jụrụ ajụ. Aguiyi-Ironsi gara ọzụzụ ndị isi agha n’afọ 1946 na Staff College Camberley dị n’England. O tutere ugo onye nchịkwa abụọ dịka leftananti n’isi ngwụcha ọzụzụ ya.

Ọ rụrụ ọrụ dị ka onye enyemaka Gọvanọ John Macpherson n'oge Agha ụwa nke abụọ(2nd World war). Ironsi dukwa ndị agha ga Kivu na Leopoldville dị na Kongo n’afọ 1960 dị ka ndị ọrụ nchedo udo na nsogbu. Na Kongo ka a nọrọ ba Ironsi "Johnny Ironside" mgbe naanị gbahapụrụ ndị nnupụisi Katangese e jidere kpọchie ebe ahụ.

Ironsi ghọrọ onyeisiala Naịjirịa mgbe ndị agha nupuru isi wee chụpụrụ onye isi ala bụ Nnamdi Azikiwe na Mịnịsta Ala bụ Abubakar Tafawa Balewa n'ọnwa Jenụwarị n’afọ1966. N'oge ahụ onye isi ala bụ Azikiwe nọ n'ụlọọgwụ na London. Ha gburu ọtụtụ ndị ndu ọ kachasị ndị si mgbago ugwu  dịka Mịnịsta Ala bụ Abubakar Tafawa Balewa. Ironsi ka ọkwa ya kachasị oge ahụ  na ndị okpuigwe, ya mere o jiri weghara ọchịchị n'agbanyeghị na ọ soghị na ndị kwaturu gọọmenti ọchịchị ntụli aka.

Ironsi gbara mbọ iji iwu gbanwe Naịjirịa n'ọnwa Machị ka Naịjiria wee dị mma site n’ihiwe gọọmentị etiti. Ndị ugwu anabataghị atụmatụ ahụ n’ihi na ujọ jidere ha na ndị Igbo nwere ebumnobi ọzọ iji megide ha. Ndị nnọchite anya mpaghara ugwu bụ ndị ọtụtụ n'ime ha na-eti isi n’ala kwaturu ọchịchị Ironsi n’ọnwa Julaị n’afọ 1966 ma gbukwa ya egbu. E gbukọdoro General Aguiyi Ironsi na Gọvanọ ndị agha mpaghara ọdịda anyanwụ bụ Lt Col. Adekunle Fajuyi ọnụ. Agụiyi Ironsi amaghị na Maj. Theophilus Danjuma nke bụ onye isi ndị nchekwa ya bụ nwa mgba ama, nke o ji ama na Maj. Danjuma na Lieut. Walbe so na otu ọchịagha mgbago ugwu nke na-akpa nkata ịkwatu ọchịchị ya. Ndị ugwu kpọrọ mbuso agha ahụ mmegwara ntaramahụhụ nke ndị Igbo mere n’ọnwa Jenụwarị mgbe ha gburu Mịnịsta Ala Naijiria bụ Abubakar Tafawa Balewa, Sardauna nke Sokoto bụ Ahmadu Bello nakwa ọtụtụ ndị ọchịagha ugwu. Ndị soro kpa nkata ahụ riri isi Agụiyi n'ọnwa Julaị bụ ndị isi dịka Joe Garba, Murtala Muhammed, Martin Adamu, Muhammadu Buhari, Paul Tarfa, Jerry Useni na Shehu Musa Yar 'Adua. Ha mechara họpụta Yakubu Gowon dị ka onye isi ala ọhụrụ n'agbanyeghị na ọ bụ onye ụka.

Ka mkpụrụ obi Agụiyi zuru ike n'ime Chineke.

Agbụrụ, asụsụ na omenala Igbo ga-adị!

A gụọla ya ugboro 934

Gụkwuo Akụkọ ndị ọzọ so:

Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!