Mgbe elu bụ ala ọsa.

Mgbe elu bụ ala ọsa.

Mgbe elu bụ ala ọsa
Mgbe ezi dị n'ukwu ụkwa
Mgbe ọ na-abụ e nye nwata ihe karịrị ya ọ jụọ ọ bụ onye ka a sị ya nye
Mgbe igirigi ndụ na-ada n'ọnụ ụtụtụ
Mgbe ezi afa ka ego
Mgbe eziokwu bụ ndụ.
Mgbe a na-edebere okenye ike na eke ọkụkọ
Mgbe ọnwa na-abụ o tiwe ije agụba nwa ngwọrọ
Mgbe ụwa mgbede ka mma
Mgbe Igbo na-asụ n'olu n'olu ma ha kwa ụkwara ọ bụrụ otu
Mgbe a naghị eresị onye ụlọ ọkụkọ ọkpa jiri
Mgbe a na-ahapụ ji n'ọkụ o ghe
Mgbe...

Agbụrụ, asụsụ na omenala Igbo ga-adi!
©️Emeka Agbaka 2018

A gụọla ya ugboro 899

Gụkwuo Akụkọ ndị ọzọ so:

Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!