Echi dị ime

Echi dị ime igbogaadi.com

Mgbe ahụ ezi dị n'ukwu ụkwa, o nwere otu ọgaranya na-akpa ezi na ọkụkọ n'ụlọ ya.
Agwọ na-arịbata n'ụlọ ụmụ anụmanụ ahụ kwa abalị na-achụgharị ọkụkọ.
Ọkụkọ wee gakwuru ezi ka ọ tụnyere ya aro ihe ya na agwọ ga-eje.
Ezi gwara ọkụkọ ya nyere ya efe na o nweghị ihe jikọrọ udele na agụba otu o sighị nwe ihe jikọrọ ya bụ ezi na agwọ.
Ọkụkọ wee hapụ ezi ga nọọrọ onwe ya.
Ezi nọrọ otu akụkụ ọ na-eriwarị ọchị ma agwọ na-achụgharị ọkụkọ kwa abalị.
O wee ruo otu abalị agwọ rịbata ma ọ hụghị ọkụkọ kama ọ hụrụ mmadụ.
Otu ihe si eme onye agwọ hụrụ bụrụ nwunye ọgaranya ahụ nwe ụmụanụmanụ nọ n'ime ụlọ ụmụ anụmanụ ahụ.
Agwọ rịịrị ga tụọ nwanyị ahụ, ka ana-ekwu ọ tụgbuo ya.
Ọ bụụrụ ọgaranya ahụ nnukwu ihe mwute pụrụ iche na nwunye ya nwụrụ.
Ọgaranya ahụ kpebiriị na akwamozu nwunye ya ga-abụ akwamozu a ga-eji kọ akụkọ, akwamozu ga-ada ụda.
Ọ gwara ụmụ odibọ ka ha gbuoro ya ezi maka akwamozu nwunye ya.
Mgbe ezi nụrụ maka ya bụ atụmatụ ọ nọrọ na-ebe na chi ya egbuo.

Nwa ọkụkọ nọrọ ebe ọ nọ chiniere ezi nku ya elu, tichagharịa ma kele Chineke.

# Mmụta!
Onye sị na ihe agbasaghị ya taata n'ihi na o metụtaghị ya chetakwa na ọ na-abụ o ruo imi o ruo anya. Onye Igbo ọ bụla nwere ọnụ okwu.
Kawa ahụ na-ekwu uche gị n'ihi na ọ bụrụ na ọ gbasaghị gị taata ọ gbasa gị echi.

 Agbụrụ, asụsụ na omenala Igbo ga-adị!

A gụọla ya ugboro 1012

Gụkwuo Akụkọ ndị ọzọ so:

Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!