Abakaliki

Abakaliki bụ ala Igbo Abakaliki bụ ala Igbo igbogaadi.org

Abakaliki so n’otu nnukwu obodo dị n’ala Igbo!

Ihe Abakaliki pụtara mgbe ochie bụ Aba Nkaleke. Aba Nkaleke bụ aha otu n'ime obodo dị n’Izzi (Nkaleke). Abakaliki abụghị obodo aka ya mgbe ochie. Ndị mbụ bi n’Abakaliki bụ ndị Izzi, ndị nke bụkarịrị ndị na-arụ ọrụ ugbo. Ndị ha na Izzi gbara agbataobi dịka ndị Ezza, Ikwo, Ọnịcha, Ngbo, ndị mbịambịa na ndị ahịa si obodo ndị ọzọ mechara bịa binyere ndị Abakaliki.

Abakaliki bụbụ obere obodo e jiri maka ahịa ihe oriri na-ekwo ekwo mara mgbe ochie. Ihe oriri jubigara ókè n’Abakaliki. Ndị Abakaliki na ndị agbataobi ha bụkarịrị ndị ọrụ ugbo. Ha ji maka na ala ha na-eme nri wee na-akọpụta ụdị nri dị iche iche dịka osikapa, ji, akpụ, ọjị, akwụkwọ nri, mmanụ nkwụ na akị. Ha nwekwuru mkpụrụ osisi ebe o buru ibu ma na-azụkwa ọtụtụ anụ ụlọ.  E jikwa igwu ihe ndị ọzọ dịka nzu, zinkị, nnu, okwute na ajịrịja okwute ebe o buru ibu mara ha.

Abakaliki taata abụrụla nnukwu obodo nwere ọtụtụ ụlọ ọrụ ọgbara ọhụrụ na ndị ọrụ bekee ebe o buru ibu n’ọnụ ọgụgụ ma ka na-ebuwanye. Ọtụtụ ndị ọrụ bekee bụ ndị mbịarambịara kwagara n’agbataobi ha na-esi ebe ahụ abịa ọrụ kwa ụbọchị n’Abakaliki.

Ọ dị mkpa ikwu na Abakaliki bụ otu n'ime ahịa ebe a gbara mgbere ohu na narị afọ nke iri na asaa (17th century). Mgbere ohu gagidere n'ihu na mpaghara ahụ n’ihi na ndị Arọ na-awakpo Abakaliki na gburugburu ha rukwa na narị afọ iri na asatọ (18th century).

Abakaliki nwere ọnụọgụgụ ruru puku mmadu iri asaa na itoolu na narị abụọ na iri asatọ (79,280).

Nrụtụaka; hometown.ng

A gụọla ya ugboro 373

Gụkwuo Akụkọ ndị ọzọ so:

Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!