EFCC enwetala ikike iweghara ụlọ Ekweremmadụ dị iri anọ

Ụfọdụ ụlọ Ekweremmadụ Ụfọdụ ụlọ Ekweremmadụ Onyonyo si na Twitter// OfficialEFCC

"Ụkwụ jie agụ, mgbada abịara ya ụgwọ - Okwu ndị mbụ na ndị egede!

Ụlọikpe ukwu gọọmenti etiti nke dị n'Abuja enyela iwu ka a napụ Ike Ekweremadu ụlọ ya ruru iri ụlọ anọ (40) n’ọnụọgụ.

Kedụ onye bụ Ike Ekweremadu? Ike Ekweremadu bụ onye bụbu osote onye isi oche ụlọ omebe iwu bụ Sineti n'aha bekee, bụ onye nke a nwụchiri na United Kingdom maka ebubo ịkpa nkata inweta akụrụ ma ọ bụ kidini n'aha bekee na-ụzọ ezighi ezi.

Ọkaikpe Inyang Ekwo nyere iwu a maka mkpesa akwụkwọ nke Ibrahim Buba degaara ya n'aha ndị otu na-ahụ maka mpụ gbasara akụ na ụba bụ EFCC n'aha ịchafụ.

Ọkaikpe Ekwo nyere ndị EFCC iwu ka ha bipụta akwụkwọ ikike iweghara ụlọ ndị ahụ n'akwụkwọ akụkọ obodo n'ime abalị asaa na-abịa abịa.

Ụbọchị Fraide gara aga ka EFCC sitere n'igwe mgbasa ozi ha wee bipụta onyonyo ụfọdụ ụlọ ndị o metụtara bụ ndị nke dị n'Enugwu na Abuja.

Agbụrụ, asụsụ na omenala Igbo ga-adị!

A gụọla ya ugboro 724
Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!