O nweghị onye ọ bụla wakporo ndị ọrụ nchekwa Gọvanọ Obiano

Gọvanọ Willie Obịanọ Gọvanọ Willie Obịanọ Igbogaadi.com

"Ikwu riri awọ anaghị ekwe na onye ọma nọ be ha - Okwu ndị mbụ na ndị egede!

Gọvanọ Anambara steeti bụ Willie Obianọ site n'aka onye ode akwụkwọ mgbasa ozi ya bụ James Eze agbaghaala akụkọ ụgha dị n’ikuku nke kwuru na ndị obu egbe wakporo ndị otu ọrụ nchekwa ya n’Ihiala.

James Eze kwuru na ha chọrọ ka ọha mara na ya bụ akụkọ bụ nnukwute asị gbara ọkpụrụkpụ nke otu mkpụrụ eziokwu adịyị n'ime ya. Ọ kọwara na Gọvanọ Obianọ nọ n’ọgbakọ ndọrọndọrọ n’okpuru ọchịchị Ọgbaru ebe ọ na-akwado usoro ndọrọndọrọ ọchịchị ọkammụta Chukwuma Soludo mgbe ahụ ndị obu egbe wakporo ndị ọrụ nchekwa n’Ihiala. Ọkammụta Chukwuma Soludo bụ onye ga-anọchite anya “All Progressive Grand Alliance (APGA)” na ntuliaka ọkwa gọvanọ n’Anambara steeti n’abali isii n’ọnwa nọvemba n'afọ puku abụọ na iri abụọ na otu (06.11.2021).

James, n’akwụkwọ mgbasa ozi ya mere ka ọha mata na ya bụ ọgbakọ ndọrọndọrọ ọchịchị nke ha mere n'Ọgbaru gara werewere dịka e siri tụ anya n'ihi na ọtụtụ ndị otu APGA nakwa ndị na-akwado ha pụtara n’igwe ịbịa kwado ọkammụta Soludo na APGA ma kwekwuazị nkwa na mkpịsị aka ha ga-abụ maka ebe e sere ọkụkọ na ntuliaka ahụ na-abịa n’ọnwa ọzọ. N’okwu ya, Gọvanọ Obianọ na ndị otu APGA so ya bịa ọgbakọ ahụ lakwara n'udo mgbe emechara mmemme ndọrọndọrọ ọchịchị ahụ na-enweghị onye ọ bụla ọkọ kọrọ ma ya bụrụzikwa imerụ ahụ.

Ọ rịọrọ ndị ma ihe ekwe na-akụ ka ha leghara ya bụ akụkọ na ndị obu egbe wakporo ndị otu oru nchekwa Gọvanọ Obianọ anya.  

O kwuru na Gọvanọ Obianọ nwere ezigbo mwute na ọbara a kwafuru n’ihiala ma na-akpọkukwa ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ndị ọzọ niile na steeti Anambara ka ha bịa soro ya menyụọ ọkụ ndọrọndọrọ ọchịchị na-achọ ịgba Anambara steeti ka ntuliaka na-abịa n’abali isii n’ọnwa nọvemba (6Nov.) wee bụrụ ntuliaka udo na nke ziri ezi.

Nrụtụaka - Ihuakwụkwọ Facebook Chief Willie Obiano

Agbụrụ, asụsụ na omenala Igbo ga-adị!

A gụọla ya ugboro 476
Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!