Ọ bụ eziokwu na Gọvanọ Ikpeazụ ji ụgwọ?

Ọ bụ eziokwu na Gọvanọ Ikpeazụ ji ụgwọ?

Afọ abụọ gara aga ka Ositadịmma Amakeze, Fada e tere mmanụ nsọ jurụ ajụjụ a!

Mmadụ ọ ga-akọwanwuru anyị ihe ego ezumike nka pụtara dịka ọ dị na steeti Abịa taata. Otu nwanyị sị na a kwụbeghị ha ụgwọ ezumike nka ha kamgbe otu afọ na ọnwa itoolu. E cheghị m na ebubo dị otu a ga-abụ eziọkwu mana ọ bụrụkwanụ na ọ bụ eziokwu?

Onye nọ #Gọvanọ Ikpeazụ nso biko kpọtụrụ ya. Kedụ otu a ga-esi gbawa ndị okenye jeere ala anyị ozi aka akwụghị ha ụgwọ ụdị ogologo oge a. Ọ bụ ka ha ghọrọzie ndị arịrịọ? Ndị okenye a bụ ndị turu ugo orụ bekee n’ihu isi.

Ndị Abia ụmụnne m nke a ọ bụ eziokwu?

Nwaynị sị na #Gọvanọ Obianọ onye nke bụ gọvanọ Anambara na-akwụ ndị nọ ezumike nka ụgwọ kwa ọnwa ọ bụla ma rịo ka Gọvanọ Obianọ metụrụ onye otu ya nọ n’Abịa ka ọ kwụọ ha ụgwọ ọnwa nke ha.

Igbogaadị wee na-ajụgharị ma ọ ka dị otu ahụ?

 

Nrụtụaka; Twitter @OsitaAmakeze

A gụọla ya ugboro 171
Go to top

Maka ọ dị mma ndị Igbo, soro kọọ akụkọ onwe gị!