Nke m dị iche

Nke m dị iche

Nke m dị iche
Nke m dị iche bụ aha
Nke m dị iche bụ ajọ aha
Nke m dị iche ọ bụ ajọ aha n'ezie?
Nke m dị iche n'ụdị omume
Nke m dị iche n'ụdị onyinye
Nke m dị iche n'ụdị amamihe
Nke m dị iche n'ụdị ọgụgụ isi
Nke m dị iche bụ ngọzi
Nke m dị iche bụ o si na Chi
Nke m dị iche amaka
Nke m dị iche na-abụ njirimara onwe
Nke m dị iche mere na akwụ chaa n'ikiri a chọwa nnụnụ ugo pịrị ọnụ
Nke m dị iche mere na a chọwa ijide oke ehi achọwa oke mmadụ
Nke m dị iche mere na òbù na-egbu agwo ma agwọ na-egbu mmadụ
Nke m dị iche nwere ihu iche ihu iche
Nke mdị iche na-enwe óké na nwunye
Nke m dị iche dị mma ma dịkwa njọ
Nke gị dị iche ya maara gị mma

Agbụrụ, asụsụ na omenala Igbo ga-adị!
©️Emeka Agbaka 2019

A gụọla ya ugboro 826

Gụkwuo Akụkọ ndị ọzọ so:

Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!